Ezra 2

Ọnụọgụgụ ndị lọtara

1Ugbu a, ndị a bụ ndị obodo niile a na-achị achị, bụ ndị sitere na ndọta nʼagha nke Nebukadneza, eze Babilọn, onye dọtara ha nʼagha buru ha laa Babilọn. Ha lọghachitere na Jerusalem nakwa Juda, onye ọbụla nʼobodo nke ha. 2Ndịisi ha na Zerubabel soo, bụ Jeshua, Nehemaya,
Nehemaya a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe a, abụghị nke dere akwụkwọ Nehemaya
Seraya, Reelaya, Mọdekai, Bilshan, Mispa, Bigvai, Rehum na Baana.

Ihe ndepụta ọnụọgụgụ ndị ikom Izrel bụ nke a:
3Ndị agbụrụ Parosh, puku abụọ, otu narị na iri asaa na abụọ (2,172).
4Ụmụ Shefataya, narị atọ na iri asaa na abụọ (372).
5Ụmụ Ara, narị asaa na iri asaa na ise (775).
6Ụmụ Pahat-Moab (site nʼụmụ Jeshua na Joab), dị puku abụọ na narị asatọ na iri na abụọ (2,812).
7Ụmụ Elam, otu puku na narị abụọ na iri ise na anọ (1,254).
8Ụmụ Zatu, narị itoolu na iri anọ na ise (945).
9Ụmụ Zakai, narị asaa na iri isii (760).
10Ụmụ Bani, narị isii na iri anọ na abụọ (642).
11Ụmụ Bebai, narị isii na iri abụọ na atọ (623).
12Ụmụ Azgad, otu puku na narị abụọ na iri abụọ na abụọ (1,222).
13Ụmụ Adonikam, narị isii na iri isii na isii (666).
14Ụmụ Bigvai, puku abụọ na iri ise na isii (2,056).
15Ụmụ Adin, narị anọ na iri ise na anọ (454).
16Ụmụ Atea, site na Hezekaya, iri itoolu na asatọ (98).
17Ụmụ Bezai, narị atọ na iri abụọ na atọ (323).
18Ụmụ Jora, otu narị na iri na abụọ (112).
19Ụmụ Hashum, narị abụọ na iri abụọ na atọ (223).
20Ụmụ Giba, iri itoolu na ise (95).

21Ndị ikom Betlehem, otu narị na iri abụọ na atọ (123).
22Ndị ikom Netofa, iri ise na isii (56).
23Ndị ikom Anatot, otu narị na iri abụọ na asatọ (128).
24Ndị ikom Azmavet, iri anọ na abụọ (42).
25Ndị ikom Kiriat Jearim,
Maọbụ, Kiriat Arim
Kefira na Beerọt, narị asaa na iri anọ na atọ (743).
26Ndị ikom Rema na Geba, narị isii na iri abụọ na otu (621).
27Ndị ikom Mikmash, otu narị na iri abụọ na abụọ (122).
28Ndị ikom Betel na Ai, narị abụọ na iri abụọ na atọ (223).
29Ndị ikom Nebo, iri ise na abụọ (52).
30Ndị ikom Magbish, otu narị na iri ise na isii (156).
31Ụmụ Elam nke ọzọ, otu puku, narị abụọ na iri ise na anọ (1,254).
32Ụmụ Harim, narị atọ na iri abụọ (320).
33Ụmụ Lod, Hadid na Ono, narị asaa na iri abụọ na ise (725).
34Ụmụ Jeriko, narị atọ na iri anọ na ise (345).
35Ụmụ Senaa, puku atọ, narị isii na iri atọ (3,630).

36Ndị nchụaja:
ndị agbụrụ Jedaya (site nʼezinaụlọ Jeshua), narị itoolu na iri asaa na atọ (973)
37ndị Imea, otu puku na iri ise na abụọ (1,052)
38ndị Pashua, otu puku na narị abụọ na iri anọ na asaa (1,247)
39ndị Harim, otu puku, otu narị na asaa (1,107).

40Ndị Livayị:
Ndị agbụrụ Jeshua na Kadmiel (nke ụmụ Hodavaya), iri asaa na anọ (74).

41Ndị ọbụ abụ:
Ndị agbụrụ Asaf,
Asaf bụ otu nʼime ndị Livayị, onye Devid họpụtara maka ịhụ ihe banyere abụ. 1Ih 15:19; 16:5
otu narị, na iri abụọ na asatọ (128).

42Ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu:
Ndị a bụ ndị nche ụlọ ukwu, ha si nʼebo Livayị. 1Ih 15:18

Ndị agbụrụ Shalum, Atea, Talmon, Akub, Hatita na Shobai. Ha dị otu narị, na iri atọ na itoolu (139).

43Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ:
Ndị agbụrụ
Maọbụ, ikwu
Ziha, Hasufa na ndị Tabaot,
44Keros, Siaha, Padon,
45Lebana, Hagaba, Akub,
46Hagab, Shalmai, Hanan,
47Gidel, Gaha, Reaya,
48Rezin, Nekoda, Gazam,
49Ụza, Pasea Besai,
50Asna, Meunim, Nefusim,
51Bakbuk, Hakufa, Hahua,
52Bazlut, Mehida, Hasha,
53Bakos, Sisera, Tema,
54Nezaya na Hatifa.
55Agbụrụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi,
ya bụ ndị agbụrụ Sotai, Hasoferet, Peruda,
56Jaala, Dakon, Gidel
57Shefataya, Hatil, na Pokeret-Hazebaim na Ami.
58Ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, na ụmụ ndị na-ejere eze Solomọn ozi, dị narị atọ na iri itoolu na abụọ (392).

59Ndị a bụ ndị ọzọ sitere nʼobodo Tel Mela, Tel Hasha, Kerub, Adọn na Imea, nke dị nʼala Peshịa lọta. Ma ha enweghị ike igosi ezinaụlọ ebe agbụrụ ha si nʼIzrel.
60Ndị agbụrụ Delaya, Tobaya na Nekoda, narị isii na iri ise na abụọ (652).

61Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja:
Ndị agbụrụ Hobaya, Hakoz na Bazilai, nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead, a kpọọ ya aha nʼaha ha.
62Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha, nʼihi ya, e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha. 63Onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe dịkarịsịrị nsọ tutu ruo mgbe e nwere onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.

64Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ, na iri isii (42,360), 65nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ
Tinyere ndị Livayị na-abụ abụ, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ na-abụ abụ nʼoge mmemme dị iche iche, dịka nʼoge ọlụlụ nwanyị, na nʼoge mmemme olili, ya bụ ọnwụ.
dị narị abụọ (200).
66Ịnyịnya dị narị asaa na iri atọ na isii (736), ebe ịnyịnya muul dị narị abụọ na iri anọ na ise (245). 67Ịnyịnya kamel ha dị narị anọ na iri atọ na ise (435), ebe ịnyịnya ibu dị puku isii, na narị asaa, na iri abụọ (6,720).

68Mgbe ha bịarutere nʼụlọ Onyenwe anyị dị na Jerusalem, ụfọdụ nʼime ndịisi ezinaụlọ nyere onyinye afọ ofufu maka i ji rụzie ụlọ Chineke ka o guzo nʼọnọdụ ya. 69Onye ọbụla nʼime ha webatara nʼụlọakụ ihe o nwere ike inye nʼihi ọrụ a. Ha nyere darik ọlaedo dị puku iri isii na otu (61,000),
Maọbụ, narị kilogram ise,
maịna ọlaọcha dị puku ise (5,000)
Maọbụ, ọlaọcha ruru puku kilogram atọ
na onyinye uwe ndị nchụaja, otu narị (100).

70Ndị nchụaja, ndị Livayị, ndị ọbụ abụ, ndị na-eche ọnụ ụzọ ama, na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ, tinyere ụfọdụ ndị mmadụ ọzọkwa, ha na ndị Izrel niile fọdụrụ gara biri nʼobodo nke aka ha.

Copyright information for IboBIU